By Paschal Chisom Obi
Amandịanaeze bụ njinịa, ma bụrụkwa eze na-achị obodo Ngwanduru. Ọ bụ onye na-ekpe ikpe nkwụmọtọ. Ọchịchị ya bụ ọchịchị onye kwuo uche ya. Chukwu ji amamihe dị oke egwu were kpube ya okpu eze, ma werekwa ihe akụ dị iche were chọọ ya mma. Ndị eze obodo dị ha gburugburu na-enye ya nsọpụrụ, ma na-akwanyekwara ya ugwu. Amandịanaeze abụghị Igwe n’ọnụ nkịtị. Amandịanaeze wuru akwa mmiri n’etiti mmiri Agụiyi na mmiri enyi. Akwa mmiri ahụ bịara jikọọ obodo Ngwanduru nakwa obodo dị iche iche, nke mere ka azụmahịa nakwa mmekọrịta obodo ha na obodo ndị ọzọ ndị mfe. Amandịanaeze anaghị eti mmanwụ a na-akwa aka. Na okporoụzọ niile gara n’obodo Ngwanduru dị obosara ma dịkwa larịị bụ Amandịanaeze. Ndị ọkwọ ụgbọala na-emuchi anya ha were na-aga ya. Ọchịchị ya chụrụ ndị abalị dị egwu ọsọ ụkwụ eru ala.
Na obodo ha nwere ọwa mmiri, mmiri ọṅụṅụ nakwa ọkụ elatiriki bụ Amandịanaeze. Ọtụtụ ụmụntorobịa na-enweghị aka ọrụ ka o megoro ka ha bụrụ mmadụ. Na ụmụ ndị ogbenye na-aga akwụkwọ bụ ya. Onye ihe ego libidoro, ọ gbakute ya, niihina ọdịghị ebinye mmadụ ego tinye ọmụrụ nwa. Onye jeghere ụzọ bịakwute ya, Amandịanaeze e were oke isi awọ ya dụọ onye ahụ ọdụ. Amandịanaeze abụghị onye soro ọnụ m, mana e sona nzọ ụkwụ m. Ụbọchị ọbụla e nwere nzacha na mkpocha obodo, Amandịanaeze na-eji mma na baro ya, pụta, soro na-asụcha ma na-ekpochasị ezi. Ọchịchị Amandịanaeze mere ka ndị mmadụ ghọta na ọrụ obodo bụ ihe dịịrị onye ukwu na onye nta. Niihi nke a, ndị niile welitere isi n’obodo Ngwanduru malitere maba onwe ha aka na-ịmere obodo ihe ọma.
Otu onye oji ego achụ ego a na-etu Akụnaesiobiike kwụụrụ ọtọ rụọ nnukwu ọnụ ụlọ ebe ọha na eze na-enwe nzụkọ. Otu n’ime aka ji ego obodo Ngwanduru nwere a na-etu Alahajị ọchịrịọzụa si ugwu Awụsa tụlata yabasị, ji, ayịya ịsha, nakwa ọtụtụ akpa osikapa, nke juru gwongworo ise n’ọnụ sị si kee ya ụmụnwaanyị isi mkpe nakwa ndị ihe ụwa na-atụ n’ọnụ. Otu nwoke na-achọghị ka aka ekpe ya mara ihe aka nri ya na-eme binyere aka n’akwụkwọ ndị ụlọ ikpe, sị na ọ chọrọ n’ọnwụ ya ka enye otu ụzọ n’ụzọ anọ ihe o nwere maka ọzụzụ ụmụaka ndị enweghị nne na nna na Ngwanduru.
Ebube Amandịanaeze na-eti ka ọnwa. Ihe na-apụ ya n’ọnụ mgbe ọbụla bụ, “Ihe ọma si gị n’obi mere ndị obodo.” Ndị eze obodo niile gbara Ngwanduru gburugburu malitere tuwe ya, “Ezedịọramma.” Ndị ọcha nụrụ maka ude Ezedịọramma, wee kpọrọ nwa ya nwoke bụ Ọkachamara, ma zụọ ya na Mahadum nke dị n’ala Bekee. N’agbanyeghị ọrụ ọma a niile, ọrịa kachiri ntị maa Ezedịọramma aka n’ihu. Nnukwu ọrịa ahụ dakwasịrị ya bụ nke ndị dibịa oyibo nakwa ndị dibịa dị iche iche gbalịrị ịgwọta, mana akwụ agbaghị mmanụ. Chi na-efo, nrịanrịa ya a na-akawanye njọ. Ezedịọramma mechara bulaa akwụkwọ. Mgbe ndị obodo nụrụ maka ọnwụ ya, ụzụ ákwá tụrụ n’elu, tụọ n’ala. Ọnwụ dị njọ. Ọnwụ amaghị eze, nke o ji ama dike. Ezedịọramma bụ dike ndị obodo Ngwanduru ji eje mba. Niihi nke a, ọnwụ ya wepụrụ onye ọbụla ihe n’ahụ.
Onye ọbụla batara n’obodo Ngwanduru n’alalaka ahụ Ezedịọramma nwụrụ ga-amata na njinji jiri. Ọbụghị ihe e ji ịgba agwa onye ọcha. Ebe niile dara jụụ ka ebe a gbara ọsọ agha. Ndị obodo Ngwanduru gbara ahịa Ameke ọtọ. Ha niile nọ n’ụlọ, gbado aka n’agba na-eche ụwa ha. Ndị ọzọ gbadoro aka n’isi na-ata ọnwụ ụta. Anwụrụ ọkụ, ụda ikwe na ọdụ nke na-apụtakarị n’ụsọekwu ndị mmadụ gbara ọsọ. Onye ọbụla batara n’obodo Ngwanduru oge ahụ ga-eche na ọ nọ n’obodo ndị dara ogbi, niihina ntamu na akara ka ha jizi agwarịta onwe ha okwu. Naanị olu nnụnụ ka a na-anụ. Ndị eze obodo dị iche iche zitere ozi iti aka n’obi nyere ndị obodo Ngwanduru maka ọnwụ onye ndu ha. Iji gosi ojuju afọ ha nwere n’ọchịchị Ezedịọramma, ndị Ichie Ngwanduru ji ọla ọcha na ọla edo wee kpụọ enyo ya. Ha kpụkwara nduru n’akụkụ enyo ahụ. Nduru ahụ bụ akara udo, nke obodo Ngwanduru ketere n’ọchịchị Ezedịọramma. Ha dosara enyo ahụ n’akụkụ okporoụzọ bara ahịa Ameke.
Ọkachamara bụ naanị otu nwa Ezedịọramma mụtara. Mgbe Ezedịọramma nwụrụ, nwa ya nwoke bụ Ọkachamara lọtara. Dịka omenala Ngwanduru siri dị, onye ọbụla tozuru ịchị obodo ahụ ga-abụrịrị onye lụgoro nwaanyị. Ọ bụ ya mere Ọkachamara jiri chọba nwaanyị dị ya mma ozigbo ọ kwachara nna ya. Ọtụtụ ndị maara na Ọkachamara na-achọ nwaanyị ọ ga-alụ malitere zipube ụmụ ha nwaanyị ahịa mgbede. Ụfọdụ n’ime ụmụnwaanyị ndị a na-etinye mbọ aka, ma kwanyekwa nku anya ka mamịwọta. Ụfọdụ n’ime na-ala nzu n’anya ka eze dibịa iji chọọ onwe ha mma. Ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-eme onye chọọ ije ozi, o si n’isi leruo onwe ya anya ruo n’ụkwụ iji hụ na ọ dị ụtọ n’anya. Ụfọdụ n’ime ha na-echu ihu be eze ka mmiri, iji mara ma ọ ga-adabara ha. Nlecha ụmụnwaanyị ndị a na-elecha dị egwu, nke mere na ụfọdụ n’ime ha na-anya akpa n’ubu oge niile. Ihe ndị dịgasị n’akpa ndị a bụ enyo, ọtanjere, nzu nakwa ọla ndị ọzọ e ji achọ mma.
Dịka ihe ndị a niile na-eme, ọ nweghị onye n’ime ha maara uche onye e ji n’ala. Dịka nna ya, Ọkachamara bụ nwoke anya ruru ala, ma bụrụkwa onye maara ihe ọ na-achọ na nwaanyị. Ka o ji anya achọ nwaanyị anya ruru ala, ka ọ hụrụ Ọlamma. Ọkachamara hụrụ Ọlamma n’ahịa Ameke, nke bụ ahịa obodo Ngwanduru ka ọ na-ere mkpụrụosisi. Ọkachamara gbanyere aka n’ukwu, ma na-ekwe n’isi ka ngwere dịka ọ na-ekiri Ọlamma. Ọ na-abụ ahụ ihe ka ubi e lee ọba. Ọkachamara kpebiri ụbọchị ahụ na ọ bụ ebe ahụ ka ọ ga-awụsa ọwara ya. Ọlamma dị mma ile anya, ma gbasie ike na nwaanyị. Ụmụokorobịa ejighị anya ahụ ya. Ụdị ukwu nakwa elu apata ụkwụ o nwere bụ nke na-eme ka dike chefuo na ogwu dị n’ụzọ. Akụkọ sịrị na ụgbọala na-ebuga ndị mmadụ ahịa Ameke akụgbuola otu nwaokorobịa niihi Ọlamma.
Nwaokorobịa ahụ amaghị mgbe o jiri banye n’etiti okporoụzọ mgbe ọ na-ele Ọlamma anya n’ukwu.
N’ezie, Ọlamma bụ ọmụ ụma asa ahụ. Ọtụtụ ụmụnwoke si obodo Ngwanduru nakwa nnukwu obodo dị iche iche na-alụ ọgụ ka ha lụọ Ọlamma, mana o nweghị onye n’ime ha zụtanwuru obi ya. Akụkọ sịrị na Ọlamma ajụla ịlụ nwa otu onyeisi ala Naịjirịa. Nwaokorobịa ahụ zuru ihe e ji nwoke eme, ma bụrụkwa onye nlekọta ụlọ ọrụ mmanụ a na-egwute n’ime ala. Etu Ọlamma si ajụ ụmụnwoke ndị chọrọ ịlụ ya bidoro tụba ndị mmadụ ụjọ. Ụfọdụ bidoro nyobe ya enyo.
Ụfọdụ sịrị na ikekwe ọ bụrụ na Ọlamma bụ ọgbanje, niihina mma ọ mara dịka nke ndị mmụọ mmiri. Nganga niile Ọlamma na-akpa egbochighi Ọkachamara ịkọwapụta ihe o bu n’obi. Ka Ọkachamara gwara Ọlamma na ebumnuche ya bụ ịlụ ya, Ọlamma kwetara. Akwụkwọ juru n’ọhịa, ma a baa n’ime ọhịa, a chọba ọkazị. Ịjụ ese a na-ajụ tupu alụmdi na nwunye bụkwa nke ndị nze na ọzọ obodo Ngwanduru mechara maka Ọlamma tupu e mee ihe n’isi ya. Ọ bụ mgbe a na-ajụ ese banyere Ọlamma ka a chọpụtara na Ọ bụ onye Amaọzara, mana ikwunne ya dị na Ngwanduru.
Mmadụ ekwesịghị ịdị na-achụ ngwere ebe ndị ọgbọ ya na-achụzị oke. N’ezie, mmadụ ime ihe o ruru ogo ya abụghị ụsa. Ngwa ngwa ndị Ichie jụchara ese ka Ọkachamara jere mee ọkụkụ aka nnabata nakwa ihe ndị ọzọ dị n’isi Ọlamma. Ụta ọbụla adịghịrị Ọkachamara, niihina onye hụrụ ụtụ n’ime ọhịa na-egbu oge, o chere na ọ bụ naanị ya nwere anya? N’ezie, alụm di na nwunye bụ ngwugwu e kechiri ekechi. Na nwaanyị amaka mma bụ na a lụbeghị ya. A lụbata nwaanyị n’ụlọ, o gosi ihe o jiri biri. Ya mere nwoke ji asa anya nke ọma na mmiri tupu ọ lụta nwaanyị. Makana nwoke ọbụla lụjọrọ nwaanyị akwọchaala aka tiere ọkụkọ akị. Nwoke ọbụla lụtara ajọ nwunye a kpaala nkụ ahụhụ, ma zụtakwa ikwe a ga-eji were na-asụ ya akwụ mgbe ọbụla. Ọ na-abụ nwoke lụọ nwaanyị, ọ mata na ụtọ nwaanyị na mma nwaanyị bụ n’omume nakwa n’echiche nwaanyị ka ọ dị. Mma eluahụ nwaanyị bụ mma ọkọchị, niihina ọ bụ n’oge ụgụrụ ka e ji ama etu onye dị.
To be continued…